Sarah Reng OchekpeSarah Reng Ochekpe
Sarah Reng Ochekpe bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijirịa nke si Plateau Ȯra Plateau. Ọ bụ onye Mịnịsta na-ahụ maka mmiri si 2011 na 2015. Mbido ndụ na AgụmakwụkwọA mụrụ Ochekpe n'ụbọchi nke anọ n'ọnwa iri, n'afọ 1961 n'ezi n'ụlọ Ali Reng Madugben na Foron, na gburugburu gọọmenti ime obodo nke Barikin Ladi di na Plateau State. O nwetara nzere mahadum nke mbụ nʻihe ọmụmụ Political Science na Ahmadu Bello University, tinyekwara nzere nke mastas nʻihe ọmụmụ Public Administration na University of Jos. O nwekwara nzere nke ogo postu grajueti nke Aberdeen College of Commerce na Nigerian Institute of Journalism.[1][2] Ndụ yaỌ na-alụ Prọfesọ Nelson Ochekpe nke si na gọọmenti ime obodo nke Otukpo di na Benue State. Ọ bụ prọfesọ nke kemistri nʻahụ maka mmepụta ọgwụ, bụrụkwa onye osote onye isi[3]nke University of Jos. Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchịOchekpe rurụ ọtụtụ ọrụ ntuzi na National Orientation Agency (Nigeria), tupuu ọrụọ ọrụ di ka minista.[1] Nʻoge ya na gọọmenti, a maara ya di ka onye bawanyere m nweta mmiri nke ndi Naijiria nke ruchara 70%, ma mepụta na gbanwee okporo mmiri nke mere ka idei mmiri kwụsị ma belata enweghị ọrụ.[4][5][6] Nʻafọ 2017, e boro ya na mmadụ abụọ ndi ọzọ ebubo wuru-wuru ego ruru nde nari naira anọ na iri ise.[7] Ebe m si dee
|