Sheila Roberts

Sheila Roberts bụ ọde akwụkwọ si mba South Africa. Ọ bụkwa onye nkụzi na University of Wisconsin-Milwaukee, Mahadum dị na US.[1]

Ihe ndụ nke Roberts

Amụrụ Roberts n'afọ 1942 na obodo Johannesburg dị na South Africa.[2] Aha nne na nna ya bu Gideon P. na Claire M. (née Freestone). Roberts nụrụ Peter Roberts n'afọ 17 January 1963 mana Peter nwụrụ n'afọ 19 April 1971. O nụrụ di ọzọ bụ ọkà mmụta Philip C. McGuire n'afo 20 June 1980. Roberts gụtụ akwụkwọ na Mahadum University of South Africa ebe ọnweteru ngalaba akwụkwọ B.A. n'afọ 1967 na ngalaba akwụkwọ M.A. n'afọ 1972; n'otu mahadum ahụ. N'afọ 1977, ọ nwetara ngalaba akwụkwọ PhD sitere na mahadum University of Pretoria.[3]

Ihe ndị odere

Outside Life's Feast (1975) bụ akwụkwọ njikota akụkọ mbụ Roberts dere. Akwụkwọ ahụ turula ugo nke Olive Schreiner Prize n'afọ 1976. Akwụkwọ egwu ọ dere, nke bụ Lou's Life and Other Poems, pụtara n'afọ 1977, ya na He's My Brother. Ebiri He's My Brother dika Johannesburg Requiem na mba North Amerika. Emechala, goomenti enye iwu ka akwusi ile ya bụ akwụkwọ.[4] Roberts dere ọtụtụ akwụ ndị ọzọ dịka The Weekenders (1981), This Time of Year (1983), Dan Jacobson (1984), akwụkwọ egwu Dialogue and Divertimenti (1985), Jacks in Corners (1987), Coming In and Other Stories (1993). Roberts turula ugo Thomas Pringle Award nke ndi English Academy of South Africa maka obere akwụkwọ akụkọ ya ọ dere na akwụkwọ mgbasa ozi, Contrast. [5]

Edensibia

  1. Gray, Stephen (2 July 2016). "Long Story Short: The Writing Life of Sheila Roberts". Current Writing: Text and Reception in Southern Africa 28 (2): 148–158. DOI:10.1080/1013929X.2016.1202043. ISSN 1013-929X. 
  2. Farewell to a classic realist (31 August 2009).
  3. Roberts, Sheila 1942- (25 May 1942).
  4. UWM professor, author cast light on apartheid.
  5. (2010) The companion to African literatures. James Currey. ISBN 978-0-85255-549-1. 

Content Disclaimer

Informasi ini disarikan dari Wikipedia dan disajikan kembali untuk tujuan edukasi. Konten tersedia di bawah lisensi CC BY-SA 3.0. Kami tidak bertanggung jawab atas ketidakakuratan data yang bersumber dari kontribusi publik tersebut.

  1. The information displayed on this website is sourced in part or in whole from Wikipedia and has been adapted for the purpose of restating it. We strive to provide accurate and relevant information, however:
  2. There is no guarantee of absolute accuracy. Wikipedia is an open, collaborative project that can be edited by anyone, so information is subject to change.
  3. It is not intended to constitute professional advice. The content displayed is for informational and educational purposes only. For important decisions (e.g., medical, legal, or financial), please consult a professional.
  4. Content copyright. Wikipedia is licensed under the Creative Commons Attribution-ShareAlike License (CC BY-SA). This means that content may be reused with appropriate attribution and shared under a similar license.
  5. Responsible use. Any risk arising from the use of information from this website is entirely the responsibility of the user.