Infọmatiks Ahụike Uche
Infọmatiks Ahụike Uche bụ alaka nke health or clinical informatics nke lekwasịrị anya n'iji teknụzụ (IT) yana ozi iji melite ahụike ụbụrụ. Dị ka infọmatiks ahụike, infọmatiks ahụ ike uche bụ usoro ọmụmụ chịkọrọ ngalaba dị iche iche nke na-akwalite nnyefe nlekọta, ime nnyocha na agụmakwụkwọ [1] yana teknụzụ na usoro ndị achọrọ iji mejuputa ya.
Ịgụ Ọnụ na itinye koodu
- Okwu ndị dị na ya yana usoro koodu ndị dịka (DSM) [2]
- Nnwale ahụike uche kpọmkwem yana usoro nnyocha ahụ [3][4]
Usoro nchịkọta data na nchekwa
Nchịkọta ozi dị n'usoro dị mkpa maka omume na-aga nke ọma. Ịchịkọta data ndị bara uru maka nnyocha ahụ na ọgwụgwọ maka ọrịa uche bụ ihe ịma aka mgba, ebe ọ bụ na anyị enweghị ọnụọgụ Biomarkers nke enwere ike iji mee ihe na infọmatiks ahụike a haziri ahazi, dị ka okpomọkụ ahụ ma ọ bụ ọbara mgbali elu. N'ụzọ dị ukwuu, nnyocha ahụ na ọgwụgwọ dị ugbu a na-agbaso ajụjụ ọnụ ahụike dị n'etiti ndị ọkachamara na ndị ọrịa. Ajụjụ ọnụ gasị abụghị naanị na ọ na-esi ike isi na ya nweta data a haziri ahazi n'ihi ahụmịhe ojieme dị iche iche, ọnọdụ, na izi ezi nke ncheta onye ọrịa. Ọganihu dị ngwa ngwa n'usoro mgbakọ na mwepụ yana nchekwa nwere ike ịgbanwe usoro nchịkọta data a.[5] Dịka ọmụmaatụ, nnyocha e mere n'afọ 2014 na Ireland nyochara iji ngwá ekwentị ọgbaraọhụrụ dekọọ ọnọdụ obi na echiche kwa ụbọchị.[6] Usoro nchịkọta dị otú ahụ ga-enye ọtụtụ data a haziri ahazi nke nsogbu ncheta ndị ọrịa na-emetụtachaghị.
- Njikọ nke ọrụ ahụike uche n'ime usoro ndekọ ahụike elektrọniiki (EHRs) na usoro nhazi buru ibu
Sensọ ekwentị na nke dijitalụ
Ịdị ebe niile nke ekwentị ọgbaraọhụrụ na ngwá nyiwe kọmputa mkpanaka ndị ọzọ na-amalite ime ka ụdị nchịkọta data ọhụrụ ndị ọzọ gasị nwee ike arụmọrụ. Ọrụ ndị na-adịbeghị anya a rụrụ ha bụ ndị mbụ na-eji nchịkọta data na-agaghị agafe agafe ejikọtara ya na nyocha iji nye ihe ndị dị mkpa dị ka: ogologo oge a na-anụta okwu mmadụ, ọrụ geospatial (ogologo ole e mere njem gaa kwa ụbọchị), mmegarį ahụ, na oge ụra.[7] Tụkwasị na nke a, ndị na-eme nchọpụta na-emepụta ngwá ekwentị ọgbaraọhụrụ dị mfe nke nwere ike iji data ndị na-adịgide dochie akụkụ nke ajụjụ ọnụ ahụike ndị na-adịghị adịgide.[8][6][9]
Nnweta ahụike site n'ịntanetị
Nnweta ahụike site n'ịntanetị, nnweta ọgwụ site n'ịntanet na nnweta nnyocha na ọgwụgwọ ụbụrụ site n'ịntanet bụ ụzọ ọhụrụ e si enye nlekọta ahụ nke teknụzụ mere ka o kwe omume. N'ụzọ doro anya, e nwere òtù ndị na-eme nchọpụta na-enyocha ojiji nke ngwá ekwentị ọgbaraọhụrụ iji na-enye árò ọgwụgwọ ma ọ bụ ihe ncheta maka ịnara ọgwụgwọ m'ọbụrụ n'o metụta ahụike uche.
Ọtụtụ n'ime akwụkwọ ọgụgụ maka inweta ahụike site n'ịntanet na-ekwu maka ọnụ ọgụ ndị ọrịa ọ na-esi ike inye nlekọta ahụike ọdịnala, dị ka ndị nọ n'ime ime obodo, ndị agha, ma ọ bụ ndị agha gara lara ezumike. Ụdị ndị a ka ọ dịịrị mfe irite uru site na omume nnweta ahụike site n'ịntanet. Nnyocha nke onye nlekota nke ụlọ ọrụ US Veterans Affairs na North Carolina yana Virginia kpughere na pasent iri atọ na isii nke ndị ọrịa na-adị echere ihe karịrị otu ọnwa maka ịhụ onye dokinta nata ụ́sà ahụike ha.[10] Ndị ọkachamara na nnweta ahụike site n'ịntanet nwere mmasị ibelata oge ichere ndị a site n'ịbawanye akụkụ nke arụmọrụ nke ịhụ dọkịta na mgbé órià.
Atụmanya ndị ọrịa
N'ezie, iwebata ojiji dị ukwuu nke teknụzụ ọhụrụ n'ime ọrụ ahụike bụ nnukwu ọpụpụ site na ọgwụgwọ ahụike uche nke dị adị. Ọtụtụ nnyocha na-enyocha mmetụta nke iwebata teknụzụ n'ime ntinye aka ahụike n'òzùzù yana ọgwụgwọ ahụike uche kpọmkwem. Nnyochagharị nke ọtụtụ nnyocha emere chọpụtara na ndị ọrịa n'izugbe nwere afọ ojuju na nlekọta ahụike ha natara site n'ịntanet, agbanyeghị na enwere nzaghachị a gwara ọgwa gbasara ịdị irè na arụmọrụ nke mmemme ahụ. N'ọtụtụ nnyocha, ọ na-esi ike ịchọpụta ma ihe nlụpụta so ya ọ bụ n'ihi mwebata teknụzụ, n'ihu na ndị odee anaghị akọwa ihe mere ha ji etinye aka dị otú ahụ.[11]
Nnyocha emere maka imewe ngwá akụrụngwa mkpanaaka ọgbaraọhụrụ na-adịghị arụ ọrụ maka ndị nọ n'afọ iri na ụma na ndị okenye na-eto eto gosipụtara na ndị nọ n'afọ iri na ụma ga-aka anabata iji teknụzụ nye aka na nsogbu ahụike uche ma ọ bụrụ na emepụtara ya dị ka ngwá ekwentị ọgbaraọhụrụ. Tụkwasị na nke a, ndị nọ n'afọ iri na ụma ga-enwekwu mkpali iji ngwá ndị dị otú ahụ ma ọ bụrụ na enwere ngwá mmekọrịta mmadụ na ibe ya ma ọ bụ nke egwuregwu, òtù ọ dị, ha gosipụtara nchegbu nwere ike ịdị banyere echiche ọjọọ banyere iji ngwá ahụ.[6] Nnyocha na-egosi na ọ bụ ezie na ọ ka na-aratụcha ndị ọrịa agadi ahụ ịnabata mgbanwe ndị enwere na nlekọta ahụ, nguzogide teknụzụ na-eso ọ̀gbọ́, na-egosi na ọ̀gbọ́ dị ugbu a na ndị ga-abịa n'ọdịnihu ga-anabata nnweta ahụike site n'ịntanet nke ọma.[12]
Teknụzụ iji kwalite omume dị mma
Na ntụkwasị n'inye data ka zie ezi na nke a pụrụ ịdabere na ya maka ndị na-enye ahụike uche, ekwentị ọgbaraọhụrụ nwere ikike inye ihe ncheta maka omume ibi ndụ dị mmá yana ije hụ dọkịta mgbe o kwesịrị. Jen Hyatt, onye guzobere na onye isi oche nke Big White Wall, ụlọ ọrụ na-ahụ maka ahụike na UK, kwuru na nlekọta ahụike uche dị ugbu a na-elekwasị anya na ọrịa karịa omume na akparamagwa ibi ndụ na-akwali ahụike.[13] Karịsịa, nnyocha egosiwo na ugboro ole anyị na-eme njem yana ịgwa ndị ọzọ okwu kwa ụbọchị bụ ihe dị mkpa na ahụike uche anyị n'òzùzù. Ngwá ndị ga-abịa n'ọdịnihu nwere ike iji usoro ọnọdụ nke dị ekwentị ndị oge a iji soro ọrụ geospatial nke ndị na-eji ha, ma tụọ aro omume ụfọdụ site na ịma ọkwa ma ọ bụrụ na achọpụta usoro dị ize ndụ.[14]
Ịbawanye inye nlekọta ahụ
Na ntụkwasị nke ụdị ọgwụgwọ na mmekọrịta ọhụrụ, iwebata teknụzụ na infọmatiks nwere ikike imeziwanye ịdị irè na arụmọrụ nke nlekọta ahụike uche dị ugbu a. Nnyocha e mere na UK chọpụtara na ntinye aka dijitalụ dị mfe dị ka izipu ozi SMS (ozi ederede) iji chetara ndị ọrịa ụbọchị ole na ole tupu ụbọchi onye ahụ kwesịrị ịga hụ dọkịta ahụike uche belatara òfùfù ya site n'ihe ruru pasent iri abụọ na ise ruo pasent iri abụọ na asatọ, na-apụta na ego e nwere ike ịchekwa karịrị ndè pounds otu narị na iri ise.[15]
Nnyocha data
Nchịkọta nke nnukwu data a haziri ahazi banyere ndị ọrịa ahụike uche na-ewebata ohere ịbụ ihe ga-ekwe omume nke nlekọta ahụike uche ịkawanye mma, iwu ahụike uche, na nghọta zuru okè nke ahụike uche. A ga-eme nyocha a na n'ógó buru ibu, ọmụmụ nke ihe mkpata ahụike uche na ahụike ọha na eze na ọnọdụ ọrịa na-efe efe.
Mkpa infọmatiks ahụike uche dị
Mkpa ọ dị itinye n'ọrụ nke infọmatiks ahụike na nlekọta ahụike nke mbụ na nke abụọ edoola onye ọbụla anya na mba ndị mepere emepe kemgbe afọ iri abụọ ma ọ bụ karịa. Ntinye n'ọrụ nke infọmatiks na ahụike uche aghọbeghị ihe zuru oke, n'agbanyeghị nkwenye ndị ọkachamara [16] ngalaba ahụ yiri ka ọ dabara adaba na kọmputa [17] yana mkpa ọ dị maka inwe akaebe nke nsonaazụ pụtara ìhè.[18][19] Enwekwara ike nwee ịsụ ngọngọ ndị ọkachamara ime mgbanwe na usoro ọrụ a kwadorola nke iwebata usoro na-agụnye. [20]
Nchegbu
Data na ozi ndị dị na kọmputa ahụike bụ nke onwe na nke dịịrị onwe. Usoro ngwanrọ zuru oke e mere maka iji nyere aka chọpụta ma gwọọ mgbaàmà ahụike uche na-ekpughe adịghị -ike nke izobe ihe ma nwee ike ịchọ ụkpụrụ nchịkwa yana nchedo data dịka HIPAA iji chebe ndị ọrịa. Otu ihe mgbochi dị mkpa nwere ike ịbụ ihere ọha na eze metụtara nsogbu uche yana mmụba nke mmetụta banyere ichebe nzuzo na nzuzo nke ndekọ na nlekọta ahụike uche.[21]
Edensibịa
- ↑ Mental health informatics - Clinfowiki. Archived from the original on 2018-01-03. Retrieved on 2018-01-02.
- ↑ NIMH » Different Approaches to Understanding and Classifying Mental Disorders. www.nimh.nih.gov. Archived from the original on 2017-12-27.
- ↑ Information for researchers and professionals about the Strengths & Difficulties Questionnaires. sdqinfo.org. Archived from the original on 2024-07-06. Retrieved on 2024-07-10.
- ↑ Dawba. Archived from the original on 2024-07-10. Retrieved on 2018-01-02.
- ↑ Aledavood (2017). "Data Collection for Mental Health Studies Through Digital Platforms: Requirements and Design of a Prototype". JMIR Research Protocols 6 (6): e110. DOI:10.2196/resprot.6919. PMID 28600276.
- ↑ 6.0 6.1 6.2 Kenny (2016). "Developing mental health mobile apps: Exploring adolescents' perspectives". Health Informatics Journal 22 (2): 265–275. DOI:10.1177/1460458214555041. PMID 25385165. Retrieved on 2019-09-29. Kenny, Rachel; Dooley, Barbara; Fitzgerald, Amanda (2016). "Developing mental health mobile apps: Exploring adolescents' perspectives" (PDF). Health Informatics Journal. 22 (2): 265–275. doi:10.1177/1460458214555041. hdl:10197/6275. PMID 25385165. S2CID 21044041. Archived (PDF) from the original on 2019-09-29. Retrieved 2019-09-29.
- ↑ Ben-Zeev (2015). "Next-Generation Psychiatric Assessment: Using Smartphone Sensors to Monitor Behavior and Mental Health". Psychiatric Rehabilitation Journal 38 (3): 218–226. DOI:10.1037/prj0000130. PMID 25844912.
- ↑ LiKamWa (2013). "MoodScope: Building a mood sensor from smartphone usage patterns", Proceeding of the 11th annual international conference on Mobile systems, applications, and services, 389–402. DOI:10.1145/2462456.2464449. ISBN 978-1-4503-1672-9.
- ↑ Luxton (2011). "mHealth for Mental Health: Integrating Smartphone Technology in Behavioral Healthcare". Professional Psychology: Research and Practice 42 (6): 505–512. DOI:10.1037/a0024485.
- ↑ Slack. "Inaccurate VA wait times preclude thousands of vets from getting outside care, probe finds", USA Today, March 3, 2017. Retrieved on April 30, 2019.
- ↑ Kruse (2017). "Telehealth and patient satisfaction: a systematic review and narrative analysis". BMJ Open 7 (8). DOI:10.1136/bmjopen-2017-016242. PMID 28775188.
- ↑ Kruse (2017). "Mobile health solutions for the aging population: A systematic narrative analysis". Journal of Telemedicine and Telecare 23 (4): 439–451. DOI:10.1177/1357633X16649790. PMID 27255207.
- ↑ Hyatt (May 9, 2016). How Big Data is Improving Mental Healthcare. Youtube. Wired UK. Archived from the original on November 19, 2020. Retrieved on April 30, 2019.
- ↑ Lam (July 24, 2018). How Your Digital Data Can Help Mental Health Research. Youtube. TEDxWanChai. Archived from the original on January 26, 2020. Retrieved on April 30, 2019.
- ↑ Sims (2012). "Text Message Reminders of Appointments: A Pilot Intervention at Four Community Mental Health Clinics in London". Psychiatric Services 63 (2): 161–168. DOI:10.1176/appi.ps.201100211. PMID 22302334. Retrieved on 2020-08-28.
- ↑ Informatics Committee. Archived from the original on 2024-07-10. Retrieved on 2018-01-02.
- ↑ Archived copy. Archived from the original on 2018-01-03. Retrieved on 2018-01-02.
- ↑ Rotheray (2014). "Innovations in Practice: Further evidence on the effectiveness of the strengths and difficulties added value score as an outcome measure for child and adolescent services". Child and Adolescent Mental Health 19 (4): 270–273. DOI:10.1111/camh.12059. PMID 32878351. Retrieved on 2020-11-05.
- ↑ Stringaris (2009). "Longitudinal outcome of youth oppositionality: Irritable, headstrong, and hurtful behaviors have distinctive predictions". Journal of the American Academy of Child & Adolescent Psychiatry 48 (4): 404–412. DOI:10.1097/CHI.0b013e3181984f30. PMID 19318881.
- ↑ Interview med Robert Goodman. Archived from the original on 2018-01-03. Retrieved on 2018-01-02.
- ↑ How Societal Stigma Complicates Privacy Protection in Digital Mental Health.
Content Disclaimer
Informasi ini disarikan dari Wikipedia dan disajikan kembali untuk tujuan edukasi. Konten tersedia di bawah lisensi CC BY-SA 3.0. Kami tidak bertanggung jawab atas ketidakakuratan data yang bersumber dari kontribusi publik tersebut.
- The information displayed on this website is sourced in part or in whole from Wikipedia and has been adapted for the purpose of restating it. We strive to provide accurate and relevant information, however:
- There is no guarantee of absolute accuracy. Wikipedia is an open, collaborative project that can be edited by anyone, so information is subject to change.
- It is not intended to constitute professional advice. The content displayed is for informational and educational purposes only. For important decisions (e.g., medical, legal, or financial), please consult a professional.
- Content copyright. Wikipedia is licensed under the Creative Commons Attribution-ShareAlike License (CC BY-SA). This means that content may be reused with appropriate attribution and shared under a similar license.
- Responsible use. Any risk arising from the use of information from this website is entirely the responsibility of the user.